Bible Nso

1. Ndi-Eze 8:50-62 Bible Nso (IGBOB)

50. Gi b͕aghara kwa ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi, na njehie-ha nile nke ha jehieworo megide Gi; Gi nye kwa ha ka enwe obi-ebere n'aru ha n'iru ndi nādọta ha n'agha, ka ha we nwe obi-ebere n'aru ha:

51. n'ihi na ndi-Gi na ihe-nketa-Gi ka ha bu, ndi I mere ka ha si n'ala Ijipt, n'etiti oké ọku ígwè ahu, puta:

52. ka anya-Gi abua we nāsaghe n'aririọ-amara orù-Gi, na n'aririọ-amara ndi-Gi, bú Israel, ige nti ha na nkpọku nile ha nākpọku Gi.

53. N'ihi na Gi onwe-gi kewaputara ha n'etiti ndi nile nke uwa, iburu Gi ihe-nketa, dika I kwuru n'aka Moses, bú orù-Gi, mb͕e I mere ka nna-ayi-hà si n'Ijipt puta, Onye-nwe-ayi, bú Jehova.

54. O rue, mb͕e Solomon kpebìri ekpere a nile na aririọ-amara a nile nye Jehova, na o siri n'iru ebe-ichu-àjà Jehova bilie, site n'ib͕u ikperè-ya abua n'ala, site kwa n'ime ka aka-ya abua b͕asa n'ebe elu-igwe di.

55. O we guzo, were oké olu gọzie nkpọkọta nile nke Israel, si,

56. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya.

57. Ka Jehova, bú Chineke-ayi, nọyere ayi, dika Ọ nọyere nna-ayi-hà: ka Ọ ghara irapu ayi, ka Ọ ghara kwa ib͕anari ayi:

58. ka O we wezuga obi-ayi ka ha biakute Ya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu.

59. Ka okwum ndia, nke m'jiri riọ amara n'iru Jehova, di kwa nso Jehova, bú Chineke-ayi, ehihie na abali, ka O we mezie ikpé orù-Ya, na ikpé ndi-Ya, bú Israel, ihe ubọchi n'ubọchi-ya:

60. ka ndi nile nke uwa we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; onye ọzọ adighi.

61. Ka obi-unu zu kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ijeghari n'ukpuru-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, otú ọ di ta.

62. Eze, ya na Israel nile, nāchu kwa àjà n'iru Jehova.