Bible Nso

1. Ndi-Eze 8:24-35 Bible Nso (IGBOB)

24. I debeworo orù-Gi Devid, bú nnam, ihe I gwara ya: I we were ọnu-Gi kwue, were kwa aka-Gi mezue ya, otú ọ di ta.

25. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, debere orù-Gi Devid, bú nnam, okwu nke I gwaworo ya, si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'irum n'inọkwasi n'oche-eze Israel; nání ọ buru na umu-gi elezi uzọ-ha anya, ijeghari n'irum dika i jeghariworo n'irum.

26. Ma ub͕u a, Chineke Israel, biko, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid nnam.

27. Ma ọ̀ bu ezie na Chineke gēbi n'elu uwa? le, elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe agaghi-anagide Gi; ulo a nke m'wuworo, ò gēsi kwa aṅa rue inagide Gi?

28. Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi ta:

29. ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di abali na ehihie, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo, Aham gādi n'ebe ahu: ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe a di.

30. Ge kwa nti aririọ-amara orù-Gi, na nke ndi-Gi, bú Israel, mb͕e ha nēkpe ekpere n'ebe ebe a di: Gi onwe-gi nuru kwa n'ebe obibi-Gi, n'elu-igwe; mb͕e I nuworo, Gi b͕aghara.

31. Ihe ọ bula nke nwoke gēmehie nime ya megide madu-ibe-ya, ewe tukwasi ya iyi ime ka ọ ṅua, iyi ahu we bia n'iru ebe-ichu-àjà-Gi n'ulo a:

32. Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, me kwa, kpe ndi-orù-Gi ikpe, igu onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.

33. Mb͕e anētib͕u ndi-Gi, bú Israel, n'iru onye-iro, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha alaghachikute Gi, kwuputa aha-Gi, kpe ekpere, riọ Gi amara n'ulo a:

34. Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, b͕aghara nmehie ndi-Gi, bú Israel, me ka ha lata n'ala nke I nyere ndi bu nna-ha.

35. Mb͕e eb͕ochiri elu-igwe, mb͕e miri-ozuzo nādighi kwa, n'ihi na ha nēmehie megide Gi; ọ buru na ha ekpe ekpere n'ebe a, kwuputa aha-Gi, si na nmehie-ha laghachi, n'ihi na I nēweda ha n'ala: