Bible Nso

1. Ndi-Eze 3:4-22 Bible Nso (IGBOB)

4. Eze we jerue Gibeon ichu àjà n'ebe ahu; n'ihi na nke ahu bu oké ebe di elu: nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri ka Solomon surere n'elu ebe-ichu-àjà ahu.

5. Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.

6. Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta.

7. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata.

8. Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha.

9. Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?

10. Okwu-ya we di nma n'anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a.

11. Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé;

12. le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.

13. Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.

14. Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.

15. Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.

16. Mb͕e ahu ndinyom abua, bú ndi nākwa iko, biakutere eze, guzo n'iru ya.

17. Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n'otù ulo; m'we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n'ulo.

18. O rue, n'ubọchi nke-atọ mb͕e m'musiri nwa, na nwayi a mu-kwa-ra nwa; ayi onwe-ayi nọ kwa n'otù ebe; ọ dighi onye ala ọzọ ayi na ya nọ n'ulo, nání ayi abua nọ n'ulo.

19. Nwa nwayi a we nwua n'abali; n'ihi na o dinakwasiri ya.

20. O we bilie n'etiti abali, kupu nwam n'akukum, ma orù-gi nwayi nāraru ura, o we dọba ya n'obi-ya, ma nwa-ya nke nwuru anwu ka ọ dọbara n'obim.

21. M'we bilie n'ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m'we tule ya n'ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m'muru.

22. Nwayi nke-ọzọ we si, É-è; kama nke di ndu bu nwam, nke nwuru anwu bu kwa nwa-gi. Ma nke-mbu nāsi, É-è; kama nke nwuru anwu bu nwa-gi, nke di ndu bu kwa nwam. Ha we kwue otú a n'iru eze.