Bible Nso

1. Ndi-Eze 22:30-34 Bible Nso (IGBOB)

30. Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya, ba n'agha.

31. Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.

32. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N'ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu.

33. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ya onwe-ya abughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi.

34. Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam.