Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:9-21 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua?

10. Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.

11. Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.

12. Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n'ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m'nāmaghi; ma mb͕e m'biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m'di na nwata.

13. Ègosighi onye-nwem ihe m'mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha?

14. Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo: ọ gēb͕ukwam.

15. Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.

16. Obadaia we je izute Ehab, gosi ya: Ehab we je izute Elaija.

17. O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?

18. Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n'iwu, i we jeso Bealim.

19. Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.

20. Ehab we zisa ozi n'etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel.

21. Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.