Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Ehab we zisa ozi n'etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel.

21. Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.

22. Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri.

23. Ka ha nye kwa ayi oke-ehi abua; ka ha rọputa-kwa-ra onwe-ha otù oke-ehi, bọ ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú, ma ka ha ghara itiye ọku: mu onwem gēdozi kwa oke-ehi nke-ọzọ, tiye n'elu nkú, ma m'gaghi-etiye ọku.

24. Unu gākpọku kwa aha chi-unu, ma mu onwem gākpọku aha Jehova: ọ gēru kwa, na chi ahu nke nēwere ọku za, onye ahu bu Chineke. Ndi Israel nile we za, si, Ọ di nma, bú okwu a.

25. Elaija we si ndi-amuma Beal, Rọputaranu onwe-unu otù oke-ehi, buru uzọ dozie ya; n'ihi na unu onwe-unu di ọtutu; kpọku-kwa-nu aha chi-unu, ma unu etiyela ọku.

26. Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere.