Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. Ègosighi onye-nwem ihe m'mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha?

14. Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo: ọ gēb͕ukwam.

15. Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.

16. Obadaia we je izute Ehab, gosi ya: Ehab we je izute Elaija.

17. O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?

18. Ọ si, Emekpaghm Israel aru; kama ọ bu gi onwe-gi, na ulo nna-gi, nime nrapu unu rapuworo ihe nile Jehova nyere n'iwu, i we jeso Bealim.

19. Ma ub͕u a ziga, chikọtaram Israel nile rue ugwu Kamel, na ndi-amuma Beal, ndi di nnù madu na ọgu abua na iri, na ndi-amuma Ashera, ndi di nnù madu, ndi nēri ihe na table Jezebel.

20. Ehab we zisa ozi n'etiti umu Israel nile, chikọta ndi-amuma ahu rue ugwu Kamel.

21. Elaija we biarue ndi Israel nile nso, si, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu ganārughari n'etiti uzọ abua ndia? ọ buru na Jehova bu Chineke, jesonu Ya: ọ buru Beal, jesonu ya. Ma ndi Israel azaghi ya okwu ọ bula.

22. Elaija we si ndi Israel, Mu onwem, abum onye-amuma Jehova fọduru, náním; ma ndi-amuma Beal di nnù ndikom na ọgu abua na iri.