Bible Nso

1. Ndi-Eze 1:31-40 Bible Nso (IGBOB)

31. Bat-sheba we rube isi kpuchie iru-ya n'ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

32. Eze, bú Devid, we si, Kpọrọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Netan, bú onye-amuma, kpọ kwa Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n'iru eze.

33. Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon:

34. ka Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, te ya manu n'ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì, si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.

35. Unu gēso kwa ya n'azu rigota, ọ gābia kwa nọkwasi n'oche-ezem; ya onwe-ya gābu kwa eze n'ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m'nyeworo iwu ibu onye-ndú Israel na Juda.

36. Benaia nwa Jehoiada we za eze, si, Amen: ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem eze, si otú a.

37. Dika Jehova nọyeworo onye-nwem, bú eze, Ya nọyere Solomon otú a, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze onye-nwem, bú eze Devid.

38. Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n'inyinya mule nke eze, bú Devid, me ka o jerue Gaihon.

39. Zedok, bú onye-nchu-àjà, we si n'Ulo-ikwū were mpi manu ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndì Israel nile we si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.

40. Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha.