Bible Nso

Ndi Kọlọsi 1:20-29 Bible Nso (IGBOB)

20. ka O we site kwa n'aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n'otù, ebe O sitesiri n'ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n'udo; site n'aka-Ya, ka m'kwuru, ma ọ bu ihe di n'elu uwa, ma-ọbu ihe di n'elu-igwe.

21. Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù

22. nime aru nke anu-aru-Ya, site n'ọnwu-Ya, iche unu n'iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo:

23. ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n'okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n'olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n'etiti ihe nile ekère èkè nke di n'okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya.

24. Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya;

25. nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n'ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke,

26. bú ihe-omimi nke ezoworo ezo site n'oge nile site kwa n'ọb͕ọ nile: ma ub͕u a ka emere ya ka ọ puta ìhè nye ndi nsọ Ya,

27. ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n'etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu:

28. Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n'amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n'iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist;

29. anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.