Bible Nso

Ezra 8:23-36 Bible Nso (IGBOB)

23. Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.

24. M'we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n'umu-nne-ha,

25. m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri:

26. m'we tùa nye ha n'aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;

27. na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.

28. M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.

29. Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n'iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n'ime-ulo nke ulo Jehova.

30. Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.

31. Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.

32. Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ.

33. Ma n'ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n'ulo Chineke-ayi nye n'aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha;

34. n'ọnu-ọgugu na n'ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n'akwukwọ na mb͕e ahu.

35. Ndi nēsi na ndọta-n'agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n'ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova.

36. Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n'ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.