Bible Nso

Ezra 5:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n'aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha.

2. Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume.

3. Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a?

4. Mb͕e ahu otú a ka ayi siri ha. Ha siri, Òle aha ndi nēwu ulo a anēwu?

5. Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.

6. Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze.

7. Ha zigara ya akwukwọ, otú a ka ede-kwa-ra nime ya; Daraiọs, bú eze, nwe akwukwọ a, udo nile diri ya.

8. Ka eze mara, na ayi jere n'ala anāchi achi, bú Juda, rue ulo Chineke uku, ma anēwere nkume nkpọrè wue ya, anēdo kwa osisi nime mb͕idi, anālu kwa ọlu a ọsọsọ, ọ nāga kwa nke-ọma n'aka-ha.