Bible Nso

Ezikiel 43:16-27 Bible Nso (IGBOB)

16. Ebe-ichu-àjà di cubit iri na abua n'ogologo-ya, na cubit iri na abua n'obosara-ya, ọ rara nrata n'akuku anọ ya rara nrata.

17. Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu.

18. O we sim, Nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ndia bu ukpuru nke ebe-ichu-àjà nkem n'ubọchi ha gēme ya, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, na iwusa ọbara n'elu ya.

19. I gēnye kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai ndi sitere na nkpuru Zedok, ndi dim nso, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ijerem ozi, nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie.

20. I gēwere kwa ufọdu n'ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n'elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n'ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya.

21. I gēwere kwa oke-ehi nke àjà-nmehie ahu, ọ gēsure kwa ya n'ebe eleputara eleputa nke ulo a, n'èzí ebe nsọ a.

22. Ma n'ubochi nke-abua i gēweta nkpi nke zuru okè ibu àjà-nmehie; ha gēwepu kwa nmehie nke ebe-ichu-àjà, dika ha si were oke-ehi wepu nmehie-ya.

23. Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n'ìgwè ewu na aturu-gi.

24. I gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

25. Ubọchi asa ka i gēdozi otù ewu kwa-ubọchi ibu àjà-nmehie: ọ bu kwa nwa-oke-ehi, na ebulu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú anu zuru okè, ka ha gēdozi.

26. Ubọchi asa ka ha gēkpuchi nmehie nke ebe-ichu-àjà, me ka ọ di ọcha; ha ewe mejue ya aka.

27. Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.