Bible Nso

Ezikiel 23:25-34 Bible Nso (IGBOB)

25. M'gēdo kwa ekworom imegide gi, ha gēmeso kwa gi n'ọnuma; imi-gi na nti-gi abua ka ha gēwezuga; ọzọ, ndi gēsota gi n'azu gāda site na mma-agha: umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom ka ha gāchiri; ọku gēripia kwa ndi gēsota gi n'azu.

26. Ha gēyipu kwa uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma.

27. M'gēme kwa ka ajọ ihe-nzube-gi kwusi n'aru gi, ya na ikwa-iko-gi nile sitere n'ala Ijipt: i gaghi-eweli kwa anya-gi abua le ha, i gaghi-echeta kwa Ijipt ọzọ.

28. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje inye gi n'aka ndi i nākpọ asì, n'aka ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ:

29. ha gēmeso kwa gi n'ikpọ-asì, wepu ihe nile i dọtara n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu, ha gārapu kwa gi i b͕arasia ọtọ: agēkpughe kwa ọtọ nke ikwa-iko-gi nile, ma ajọ ihe-nzube-gi ma ikwa-iko-gi nile.

30. Agēme gi ihe ndia, n'ihi na i kwasoro mba di iche iche iko, n'ihi na i jiwo arusi nile ha rua árú.

31. N'uzọ nwa-nne-gi nwanyi ka i jeworo ije; M'gēwere kwa ìko-ya nye gi ṅ'aka.

32. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Iko nwa-nne-gi nwanyi ka i gāṅu, bú iko nke miri emi nke sa-kwa-ra mbara: i gāghọ onye anāchì ọchì na onye anākwa emò: ọ nānagide ihe ri nne.

33. N'iṅubiga-manya-ókè na ihe-nb͕u ka i gējuputa, n'iko ihe-iju-anya na itọb͕ọrọ-n'efu, n'iko nwa-nne-gi nwanyi, bú Sameria.

34. I gāṅu kwa ya, ṅusia ya, ọbuná ejùjù-ya nile ka i gāracha, ara-gi abua ka i gādọwapu: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.