1. Okwu Jehova we ruem nti, si,
2. Nwa nke madu, tua otù ilu, tu-kwa-ra ulo Israel otù ilu;
3. si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:
4. ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n'ala izu-ahia; n'obodo ndi-ahia ka o doro ya.
5. O we chiri ufọdu na nkpuru ala ahu, kua ya n'ubi di nma iku nkpuru; ọ kuru ya n'akuku ọtutu miri; dika osisi willow ka o tiyere ya.
6. O we pue, ghọ osisi vine nāwasa awasa nke di nkpunkpu, nke alaka-ya nile chere ya iru, nkpọrọgwu-ya nile di kwa n'okpuru ya: o we ghọ osisi vine, waputa ngalaba, wa alaka mara nma.
7. Ugo uku ọzọ di kwa, nke nkù-ya abua di uku, uruma-ya di kwa ọtutu: ma, le, osisi vine a rubere nkpọrọgwu-ya nile n'ebe ọ nọ, ọ bu kwa alaka-ya nile ka ọ wara n'ebe ọ nọ site na nkpuru nile nke ebe akuru ya, ka o we b͕a ya miri.
8. N'ubi ọma n'akuku ọtutu miri ka akuru ya, ka o we waputa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi vine mara nma.
9. Si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ bughi nkpọrọgwu-ya nile ka ọ gēropu, bipu kwa nkpuru-ya, ka o we kpọnwua; ka akwukwọ ndu nile nke npute-ya we kpọnwua; ọ̀ gaghi-eji kwa ogwe-aka uku ma-ọbu ndi bara uba iropu ya site na nkpọrọgwu-ya nile?
10. Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu.
11. Okwu Jehova we ruem nti, si,
12. Biko, si ulo nnupu-isi ahu, Ùnu amaghi ihe ihe ndia bu? si, Le, eze Babilon biaruru Jerusalem, were eze-ya, na ndi-isi-ya, me ka ha biakute ya rue Babilon;
13. o we were otù onye sitere na nkpuru ala-eze ahu, ya na ya we b͕a ndu; o we me ka ọ ba n'ọb͕ub͕a-iyi, ọ bu kwa ndi nile di ike nke ala-ya ka ọ chiri: