Bible Nso

1. Ndi-Eze 7:5-19 Bible Nso (IGBOB)

5. Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n'ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

6. O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha.

7. Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n'ala ulo rue ala ulo.

8. Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye,) dika uzọ-nbata nka.

9. Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n'ime na n'èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n'èzí rue ogige uku ahu.

10. Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ.

11. Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n'elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar.

12. Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe.

13. Eze Solomon we ziga si na Taia kuputa Hairam.

14. Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.

15. O we kpua ogidi ọla abua, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di: ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ogidi nke-abua buruburu.

16. O me-kwa-ra isi abua nke ọla awuru awu, itiye n'elu ogidi: cubit ise ka idi-elu otù isi di, cubit ise ka idi-elu isi nke-ọzọ di kwa.

17. Ihe-ọkpukpa, bú ihe emere ka ha yie ihe-ọkpukpa, na ihe aturu atu, bú ihe emere ka ha yie iyab͕a, diri isi nke di n'elu ogidi abua; asa diri otù isi, asa di-kwa-ra isi nke-ọzọ.

18. O me ogidi abua ahu; akuku abua dikwasi otù ihe-ọkpukpa buruburu, ikpuchi isi nke di n'elu pomegranate: otú a ka o me-kwa-ra isi nke-ọzọ.

19. Isi nke di n'elu ogidi n'uzọ-nbata ahu bu ihe emere ka ha yie urodi, cubit anọ.