Bible Nso

1. Ndi-Eze 7:32-39 Bible Nso (IGBOB)

32. Wheel anọ ahu di n'okpuru ihe-njikọ: aka wheel di n'ihe-ndọkwasi: idi-elu otù wheel di otù cubit na nkera cubit.

33. Otú emere wheel nile di ka esi eme wheel ub͕ọ-ala: aka nile ha, na azu nile ha, na ihe nile nējikọta ha, na etiti nile ha, awuru ha nile awu.

34. Ubu anọ di na nkuku anọ nke ihe-ndọkwasi ọ bula: ubu-ya sitere n'ihe-ndọkwasi ahu.

35. Ihe di gburugburu gburugburu, nke idi-elu-ya di nkera cubit, di n'elu ihe-ndọkwasi ahu: aka-ya nile na ihe-njikọ-ya nile, nke di n'elu ihe-ndọkwasi ahu sitere na ya.

36. O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n'elu mbadamba aka-ya nile, na n'elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu.

37. Otú a ka o mere ihe-ndọkwasi iri ahu: ha nile nwere otù ọwuwu, na otù ọtùtù, na otù ọpipi.

38. O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n'elu ihe-ndọkwasi ọ bula n'ihe-ndọkwasi iri ahu.

39. O tiye ihe-ndọkwasi ahu, ise n'akuku aka-nri ulo ahu, ise n'akuku aka-ekpe ulo ahu: o tiye kwa oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu, na ncherita iru Ndida.