Bible Nso

1. Ndi-Eze 6:29-38 Bible Nso (IGBOB)

29. Ọ tu-kwa-ra mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu n'eb͕ub͕u nke ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, n'ime na n'èzí.

30. Ọ machita-kwa-ra ala ulo ahu ọla-edo, n'ime na n'èzí.

31. O me ibo-uzọ osisi manu olive tiye n'ọnu-uzọ ime-ime-ulo ahu: ọfiere-uzọ na awara-uzọ abua bu otù uzọ n'uzọ ise nke mb͕idi.

32. Ibo-uzọ abua ahu bu osisi manu olive; ọ pia n'elu ha ihe-ọpipi, bú cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa, ọ machita ha ọla-edo; o tisa kwa ọla-edo n'aru cherubim, na n'aru nkwu.

33. Otú a ka o me-kwa-ra awara-uzọ abua nke osisi manu olive itiye n'ọnu-uzọ ulo uku Chineke, site n'otù uzọ n'uzọ anọ nke mb͕idi;

34. na ibo-uzọ abua nke osisi fir; ibewa-uzọ abua nke otù ibo-uzọ nāga buruburu, ibewa-uzọ abua nke ibo-uzọ nke-ọzọ nāga kwa buruburu.

35. Ọ pia n'elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n'elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha.

36. O were akuku nkume awara awa atọ na otù ariri osisi cedar awara awa wue ogige ime-ime.

37. N'arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n'ọnwa Ziv.

38. Ma n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n'ihe-ya nile na n'ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n'iwu ya.