Bible Nso

1. Ndi-Eze 22:28-33 Bible Nso (IGBOB)

28. Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile.

29. Eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, we rigorue Remot-gilead.

30. Eze Israel we si Jehoshafat, M'gēnwoghari onwem, ba n'agha; ma gi onwe-gi yikwasi uwe-gi. Eze Israel we nwogharia onwe-ya, ba n'agha.

31. Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.

32. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru Jehoshafat, na ha onwe-ha siri, N'ezie eze Israel ka ọ bu; ha we wezuga onwe-ha ibuso ya agha: Jehoshafat we tie nkpu.

33. O rue, mb͕e ndi-isi ub͕ọ-ala huru na ya onwe-ya abughi eze Israel, ha we si n'iso ya laghachi.