Bible Nso

1. Ndi-Eze 20:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Eze Israel we za, si, Kwuenu, si ya, Ka onye nēke ekike-agha-ya ghara ito onwe-ya dika onye nēkepu ya.

12. O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu.

13. Ma, le, otù onye-amuma biaruru Ehab, bú eze Israel, nso, si, Otú a ka Jehova siri, Ì huwo oké ìgwè madu nile a? le, anamenye ya n'aka-gi ta; i gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.

14. Ehab we si, Sìte n'aka onye? Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Site n'aka umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi. Ọ si, Ònye gāmalite agha ahu? Ọ si, Gi onwe-gi.

15. O we gukọta umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, ha we di ọgu iri-na-otù na iri na abua: mb͕e agukọtasiri ha ọ gukọta ndi-ya nile, bú umu Israel nile, nnù iri-na-asa na ọgu iri.

16. Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.