Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:26-42 Bible Nso (IGBOB)

26. Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere.

27. O rue, n'etiti-ehihie, na Elaija kwara ha emò, si, Werenu oké olu kpọ: n'ihi na chi ka ọ bu; n'ihi na ọ nātughari uche-ya, ma-ọbu na o wezugawo onwe-ya, ma-ọbu na ọ nọ n'ije, ma-ọbu eleghi anya ya onwe-ya nāraru ura, ma ọ gēteta.

28. Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha.

29. O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.

30. Elaija we si ndi Israel nile, Biaruenu nsom; ndi Israel nile we biarue ya nso. O dozie ebe-ichu-àjà Jehova nke etipiara.

31. Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi.

32. Ọ chiri nkume ahu wue ebe-ichu-àjà n'aha Jehova; ọ me ebe miri gādọrọ, ra ka ebe gānagide mb͕é nkpuru-ọghigha abua, buruburu ebe-ichu-àjà.

33. O do nkú n'usoro, bọ oke-ehi-ya n'ọbubọ-ya, tukwasi ya n'elu nkú. Ọ si, B͕ajuenu okpokoro anọ miri, wukwasi ya n'elu àjà-nsure-ọku, na n'elu nkú.

34. Ọ si, Menu ya nke ub͕ò abua; ha we me ya nke ub͕ò abua. Ọ si, Menu ya nke ub͕ò atọ; ha we me ya nke ub͕ò atọ.

35. Miri ahu we nērughari ebe-ichu-àjà ahu buruburu; ọ b͕aju kwa ebe ahu miri nādọrọ miri.

36. O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.

37. Zam, Jehova, zam, ka ndi nka we mara na Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke, na Gi onwe-gi echighariwo kwa obi-ha ilata.

38. Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.

39. Ndi Israel nile we hu ya, da kpue iru-ha n'ala, si, Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke.

40. Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.

41. Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.

42. Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.