Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na okwu Jehova ruru Elaija nti, n'arọ nke-atọ, si, Je, me ka Ehab hu gi anya; M'gēnye kwa miri-ozuzo n'elu uwa.

2. Elaija we je ime ka Ehab hu ya anya. Ma oké unwu ahu siri ike na Sameria.

3. Ehab we kpọ Obadaia, onye bu onye-isi ulo-ya. (Ma Obadaia nātu egwu Jehova nke-uku:

4. o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)

5. Ehab we si Obadaia, Jegharia n'ala, rue isi-iyi nile nke miri, ru kwa miri-iyi nile: eleghi anya ayi gāchọta ahihia, we me ka inyinya na inyinya mule di ndu, ka ayi we ghara ibipu anu n'anu-ulo-ayi.

6. Ha we kewara onwe-ha ala ahu igabiga nime ya: Ehab jere n'otù uzọ, nání ya, Obadaia je-kwa-ra n'uzọ ọzọ, nání ya.

7. Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?

8. Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.

9. Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua?

10. Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.

11. Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.

12. Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n'ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m'nāmaghi; ma mb͕e m'biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m'di na nwata.