Bible Nso

1. Ndi-Eze 13:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. Onye nke Chineke ahu we si eze, Ọ buru na i nyem nkera ulo-gi, m'gaghi-esoro gi ba, m'gaghi-eri kwa nri, m'gaghi-aṅu kwa miri n'ebe a:

9. n'ihi na otú a ka enyerem iwu n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, alaghachi-kwa-la n'uzọ i siri je.

10. O we la n'uzọ ọzọ, ọ laghachighi kwa n'uzọ o siri biaru Bet-el.

11. Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.

12. Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia.

13. O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n'elu ya.

14. O we jeso onye nke Chineke ahu n'azu, chọta ya ka ọ nānọdu n'okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem.

15. Ọ si ya, Sorom je n'ulo, ri kwa nri.

16. Ọ si, Apughm isoro gi laghachi, ma-ọbu isoro gi ba n'ulo: m'gaghi-esoro kwa gi ri nri ma-ọbu iṅu miri n'ebe a:

17. n'ihi na okwu rurum nti n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n'ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n'uzọ ahu i jere nime ya.

18. Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha.

19. O we soro ya laghachi, rie nri n'ulo-ya, ṅu kwa miri.