Bible Nso

Habakuk 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. N'elu ebe m'nēche ka m'gēguzo, guzo kwa onwem n'elu ebe ewusiri ike, m'gēche kwa ihu ihe Ọ gēkwu megidem, na ihe m'gāzaghachi bayere iba-nbam.

2. Jehova we zam, si, De ọhù ahu n'elu mbadamba-ihe di iche iche, tu ya akika, ka onye nāgu ya we b͕a ọsọ.

3. N'ihi na ọhù ahu nādiru mb͕e akara àkà, ọ nēkusi-kwa-ra ọgwugwu-ya ume ike, ọ gaghi-ekwu kwa okwu-ugha: ọ buru na ọ la azu, chere ya; n'ihi na ọ ghaghi ibia, ọ gaghi-anọ ọdù.

4. Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu.

5. E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ.