Bible Nso

Ezra 8:2-14 Bible Nso (IGBOB)

2. Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush.

3. Site n'umu Shekania; site n'umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri.

4. Site n'umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri.

5. Site n'umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.

6. Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.

7. Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.

8. Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.

9. Site n'umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.

10. Site kwa n'umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ.

11. Site kwa n'umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ.

12. Site kwa n'umu Azgad, Johanan nwa Hakatan; ndi soro ya di ọgu ndikom ise na iri.

13. Site kwa n'umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ.

14. Site kwa n'umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.