Bible Nso

Ezra 4:7-23 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria.

8. Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a:

9. mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam,

10. na mba fọduru ndi Ọsnapa di uku di kwa ebube mere ka ha bia biri n'ala a, o we me ka ha nọdu n'obodo Sameria, ha na ndi fọduru n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.

11. Nka bu ndeputa edeputara n'akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.

12. Ka eze mara, na ndi-Ju, bú ndi siri n'ebe i nọ rigokute ayi, ha abawo na Jerusalem; ha nēwu obodo ahu nke nupuru isi nēsì kwa ísì, ha ewubìwo mb͕idi-ya nile, jikọta ntọ-ala-ya nile.

13. Ub͕u a, ka eze mara, na, ọ buru na ewue obodo a, wuzu kwa mb͕idi-ya nile, ọ dighi utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ, ha gātu, ma n'ikpe-azu ọ gēme ka ihe funari ndi-eze.

14. Ub͕u a, n'ihi na nnú ulo uku eze bu nnú-ayi, na n'ihi na ayi enweghi ntachi-obi ihu ọtọ nke eze, ayi we zìe ozi me ka eze mara;

15. ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.

16. Ayi onwe-ayi nēme ka eze mara na, ọ buru na ewue obodo a, luzu kwa mb͕idi-ya nile, n'ihi ya ọ dighi òkè i gēnwe n'ofè osimiri.

17. Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a.

18. Akwukwọ-ozi ahu nke unu zitere ayi, aguputawo ya nke-ọma n'irum.

19. M'we nye iwu, ewe chọ, chọputa na obodo a, site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, nēbuli onwe-ya imegide ndi-eze, anākpali kwa madu inupu isi na imegide ndi-isi nime ya.

20. Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n'aru ndi nile nọ n'ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ.

21. Ub͕u a nyenu iwu ime ka ndikom a kwusi, ka aghara kwa iwu obodo a, rue mb͕e m'gēnye iwu.

22. Lezi-kwa-nu anya ka nmehie ghara idi n'ime ihe a: n'ìhi gini ka ihe ọjọ a gādi uku ime ka ihe funari ndi-eze.

23. Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n'iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi.