Bible Nso

Ezikiel 42:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha.

10. N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.

11. Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di.

12. Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha.

13. O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.

14. Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n'ebe nsọ ahu puta n'ogige di n'èzí, kama n'ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n'ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha.

15. Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile.

16. O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Iru-anyanwu nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya buruburu.

17. O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Ugwu buruburu, nnù ami na ọgu ise.

18. Akuku Ndida ka ọ tùru, nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya.

19. O chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu, were ami o ji atù ihe tùa ya, nnù ami na ọgu ise.

20. N'akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n'etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.