Bible Nso

Ezikiel 42:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. O we me ka m'puta ba n'ogige ahu di n'èzí, n'uzọ ahu nke di n'uzọ Ugwu: o we me ha m'ba n'ime-ulo ahu nke di na ncherita-iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, nke di kwa na ncherita-iru ulo ahu anēwu ewu n'akuku Ugwu.

2. N'iru ogologo nke ọgu cubit ise ka ọnu-uzọ nke Ugwu di, obosara-ya di kwa ọgu cubit abua na iri.

3. Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ.

4. N'iru ime-ulo nile ka otù uzọ-njeghari di, nke di cubit iri n'obosara n'ime, ọ bu uzọ nke di otù cubit: ọnu-uzọ nile ha chere iru n'Ugwu.

5. Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n'ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n'ime-ulo di ala ma-ọbu n'ime-ulo etiti, n'ulo ahu anēwu ewu.

6. N'ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n'ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n'ala.