Bible Nso

Ezikiel 37:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Okwu Jehova we ruem nti, si,

16. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were otù osisi n'onwe-gi, de n'elu ya, Nke Juda, na nke umu Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù: were kwa osisi ọzọ, de n'elu ya, Nke Josef, osisi Efraim, na nke ulo Israel nile ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù:

17. gi jikọta kwa ha, otù na ibe-ya, nye onwe-gi, ka ha ghọ otù osisi, ka ha we ghọ otù n'aka-gi.

18. Ma mb͕e umu ndi-gi gāgwa gi okwu, si, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe i nọ?

19. gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n'aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù; M'gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n'akam.

20. Osisi abua ahu nke i nēde ihe n'elu ha gādi kwa n'aka-gi n'anya-ha.

21. Gwa kwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem ganāchiputa umu Israel n'etiti mba nile, ebe ha jere, M'gāchikọputa kwa ha n'akuku nile, me ka ha bata n'ala-ha: