Bible Nso

Ezikiel 36:23-35 Bible Nso (IGBOB)

23. M'gēdo kwa aha ukum nsọ, nke emere ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti ha; mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e agēdom nsọ nime unu n'anya-ha.

24. M'gēweputa kwa unu n'etiti mba nile, chikọputa kwa unu n'ala nile, me ka unu bata n'ala-unu.

25. M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.

26. M'gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu: M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru.

27. Mọ nkem ka M'gētiye nime unu, me ka ọ buru n'ukpurum nile ka unu gējeghari, ọ bu kwa ikpém nile ka unu gēdebe, me ha.

28. Unu gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyere nna-unu-hà; unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.

29. M'gāzọputa kwa unu n'iru-árú nile unu: M'gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M'gaghi-atukwasi unu oké unwu.

30. M'gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n'etiti mba nile ọzọ.

31. Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'anya-unu n'ihi ajọ omume nile unu na n'ihi ihe-árú nile unu.

32. Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), maranu nka: ka ihere uzọ nile unu me unu, ka etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere, unu ulo Israel.

33. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'mere ka unu si n'ajọ omume nile unu di ọcha, n'ubọchi ahu ka M'gēme ka madu bi n'obodo nile unu, agēwu kwa ebe nile tọb͕ọrọ n'efu.

34. Ala-ubi ahu nke tọb͕ọrọ n'efu ka agālu kwa, n'ọnọdu ibu ebe tọb͕ọrọ n'efu n'anya onye ọ bula nāgabiga.

35. Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n'efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n'efu, nke akwaturu n'ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha.