Bible Nso

Ezikiel 36:19-36 Bible Nso (IGBOB)

19. M'we chusa ha n'etiti mba nile, ha we b͕asa n'ala nile: dika uzọ-ha si di, na dika omume nile ha si di, otú a ka M'kpere ha ikpe.

20. Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n'ala-Ya ka ha siri puta.

21. Ma enwerem ọmiko n'aru aha nsọm, nke ulo Israel mereri ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, ebe ha biara.

22. N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara.

23. M'gēdo kwa aha ukum nsọ, nke emere ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti ha; mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e agēdom nsọ nime unu n'anya-ha.

24. M'gēweputa kwa unu n'etiti mba nile, chikọputa kwa unu n'ala nile, me ka unu bata n'ala-unu.

25. M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.

26. M'gēnye kwa unu obi ọhu, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu: M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-unu, nye unu obi nke bu anu-aru.

27. Mọ nkem ka M'gētiye nime unu, me ka ọ buru n'ukpurum nile ka unu gējeghari, ọ bu kwa ikpém nile ka unu gēdebe, me ha.

28. Unu gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyere nna-unu-hà; unu gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke.

29. M'gāzọputa kwa unu n'iru-árú nile unu: M'gākpọ kwa ọka, me ka ọ ba uba, M'gaghi-atukwasi unu oké unwu.

30. M'gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n'etiti mba nile ọzọ.

31. Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'anya-unu n'ihi ajọ omume nile unu na n'ihi ihe-árú nile unu.

32. Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), maranu nka: ka ihere uzọ nile unu me unu, ka etiye kwa unu n'ọnọdu-ihere, unu ulo Israel.

33. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'mere ka unu si n'ajọ omume nile unu di ọcha, n'ubọchi ahu ka M'gēme ka madu bi n'obodo nile unu, agēwu kwa ebe nile tọb͕ọrọ n'efu.

34. Ala-ubi ahu nke tọb͕ọrọ n'efu ka agālu kwa, n'ọnọdu ibu ebe tọb͕ọrọ n'efu n'anya onye ọ bula nāgabiga.

35. Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n'efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n'efu, nke akwaturu n'ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha.

36. Mba nile nke fọduru n'ala di unu buruburu gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, ewuwo ebe nile akwaturu akwatu, ku kwa ubi nke tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu, M'gēme kwa ya.