Bible Nso

Ezikiel 27:22-34 Bible Nso (IGBOB)

22. Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.

23. Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.

24. Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n'ihe di iche iche mazuru nma, n'ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n'ib͕e juputara n'uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n'etiti ihe-ahia-gi.

25. Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n'etiti oké osimiri nile.

26. Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile.

27. Àkù-gi, na ihe-ahia-gi nile, na ihe-izu-ahia-gi, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi, na ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi, na ndi nāzu ahia-gi, na ndi-agha-gi nile, ndi nọ nime gi, na nime nkpọkọta-madu nile nke gi nke di n'etiti gi, gādabà n'etiti oké osimiri nile n'ubọchi ọdida-gi.

28. N'olu iti-nkpu nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi azu-obodo-gi nile gēme nkpatu.

29. Ndi nile ndi nānya umara, na ndi-ub͕ọ, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ nile nke oké osimiri, gēsi kwa n'ub͕ọ-ha ridata, n'elu ala ka ha gēguzo,

30. me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:

31. ha gēme-kwa-ra onwe-ha isi-nkwọcha n'ihi gi, ke ákwà-nkpe n'úkwù, kwara gi ákwá n'idi-ilu nke nkpuru-obi n'iti-aka-n'obi di ilu.

32. Ha gēbuliri gi abù-ákwá n'igo-ákwá-ha, bùara gi abù-ákwá, si, Ònye di ka Taia, ònye di ka obodo ahu nke emere ka o dere du n'etiti oké osimiri?

33. Mb͕e ihe-ahia-gi nile siri n'oké osimiri nile puta, i mere ka afọ ju ọtutu ndi di iche iche; i jiri iba-uba nke àkù-gi na nke ihe-izu-ahia-gi nile me ndi-eze nke uwa ka ha buru ọgaranya.

34. Na mb͕e etiwara gi site n'oké osimiri nile n'ebe miri emi nke miri, ihe-izu-ahia-gi na nkpọkọta-madu nile nke gi dara ada n'etiti gi.