Bible Nso

Ezikiel 24:4-12 Bible Nso (IGBOB)

4. chikọta anu-ya abọrọ abọ nime ya, bú ọbubọ ọ bula di nma, utaku-ukwu, na ọlu-aka; kpojue ya n'ọkpukpu arọputara arọputa.

5. Were aturu arọputara arọputa n'ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n'okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n'etiti ya.

6. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu, bú ite nke nchara-ya di nime ya, nke nchara-ya nāpughi nime ya! weputa ya n'ọbubọ n'ọbubọ; nzà amaghi ya.

7. N'ihi na ọbara-ya adiwo n'etiti ya; n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n'ala, ikpuchi ya ájá;

8. ka o we me ka ọnuma rigota ibọ̀ ọ́bọ̀, ya ka M'ji tiye ọbara-ya n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya, ka ewe ghara ikpuchi ya.

9. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu! Mu onwem gēme kwa ka obo-ya di uku.

10. Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile.

11. Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.

12. O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n'ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n'ọku ka nchara-ya di.