Bible Nso

Ezikiel 24:22-27 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.

23. Ihe-ike-n'isi-unu gādi kwa unu n'isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n'ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n'obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n'ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude.

24. Ezikiel ewe ghọrọ unu ihe-ebube; dika ihe nile nke o meworo si di, otú a ka unu gēme: mb͕e nka gābia, unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

25. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi mb͕e M'napuru ha ebe-ha siri ike, bú ihe-obi-utọ nke ima-nma-ha, na ihe anya-ha abua nāchọsi ike, na ihe ha buliworo nkpuru-obi-ha nye, bú umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,

26. ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi ahu na onye b͕apuru ab͕apu gābiakute gi, ime ka i were nti-gi abua nu ya?

27. N'ubọchi ahu ka agāsaghe ọnu-gi n'ebe onye b͕apuru ab͕apu nọ, i gēkwu kwa okwu, ghara ida kwa ob͕i ọzọ: i we ghọrọ ha ihe-ebube; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.