Bible Nso

Ezikiel 24:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. Nwa nke madu, dere onwe-gi aha nke ubọchi a, bú ubọchi nke ta: eze Babilon kwagidere Jerusalem n'ubọchi nke ta.

3. Tu-kwa-ra ulo nnupu-isi ahu ilu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Sikwasi ite ahu, sikwasi ya, ọzọ kwa, b͕aye ya miri:

4. chikọta anu-ya abọrọ abọ nime ya, bú ọbubọ ọ bula di nma, utaku-ukwu, na ọlu-aka; kpojue ya n'ọkpukpu arọputara arọputa.

5. Were aturu arọputara arọputa n'ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n'okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n'etiti ya.

6. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu, bú ite nke nchara-ya di nime ya, nke nchara-ya nāpughi nime ya! weputa ya n'ọbubọ n'ọbubọ; nzà amaghi ya.

7. N'ihi na ọbara-ya adiwo n'etiti ya; n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n'ala, ikpuchi ya ájá;

8. ka o we me ka ọnuma rigota ibọ̀ ọ́bọ̀, ya ka M'ji tiye ọbara-ya n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya, ka ewe ghara ikpuchi ya.

9. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu! Mu onwem gēme kwa ka obo-ya di uku.

10. Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile.

11. Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.

12. O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n'ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n'ọku ka nchara-ya di.

13. N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.

14. Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M'gēme kwa ya; M'gaghi-arapu, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Okwu Jehova we ruem nti, si,

16. Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.