46. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka nkpọkọta madu rigota imegide ha, M'gēwere kwa ha nye ka ha ghọ ihe-ntughari na ihe-nluta-n'agha.
47. Nkpọkọta madu ahu gēwere kwa nkume tub͕ue ha, were mma-agha-ha b͕ue ha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha gēb͕u, ulo nile ha ka ha gēsure n'ọku.
48. M'gēme kwa ka ajọ nzube kwusi n'ala-unu, ka ewe dọ ndinyom nile aka na nti, ha ewe ghara ime dika ajọ nzube-unu si di.
49. Ha gētiyekwasi kwa unu ajọ nzube-unu, ọ bu kwa nmehie nile nke arusi nile unu ka unu gēbu: unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.