Bible Nso

Ezikiel 20:34-40 Bible Nso (IGBOB)

34. M'gēji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka esetiri eseti, ji kwa ọnuma awusiri awusi, me ka unu si na ndi nile di iche iche puta, chikọputa kwa unu n'ala nile ebe unu b͕asaworo:

35. M'gēme kwa ka unu bata n'ọzara nke ndi nile di iche iche, Mu na unu gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu iru na iru.

36. Dika Mu na nna-unu-hà kpere ikpe n'ọzara nke ala Ijipt, otú a ka Mu na unu gēkpe ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

37. M'gēme kwa ka unu gabiga n'okpuru nkpa-n'aka, M'gēme kwa ka unu ba n'ihe-nkegide nke ọb͕ub͕a-ndum;

38. M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

39. Ma unu onwe-unu, ulo Israel, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Jenu, fè, onye ọ bula arusi-ya nile, ma emesia unu aghaghi igem nti: ma unu agaghi-eji onyinye nile unu na arusi nile unu me ka aha nsọm ghara idi nsọ ọzọ.

40. N'ihi na n'ugwu nsọm, n'ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n'ala-ha: n'ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu.