Bible Nso

Ezikiel 20:22-27 Bible Nso (IGBOB)

22. Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha.

23. Mu onwem weli-kwa-ra ha akam n'ọzara, si, na M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile;

24. n'ihi na ha emeghi ihem nile ekpere n'ikpe, ọ bu kwa ukpurum nile ka ha juru, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ, ọ bu kwa n'iso arusi nile nke ndi bu nna-ha ka anya-ha di.

25. Ọzọ, enye-kwa-ram ha ukpuru di iche iche nke nādighi nma, na ikpe di iche iche nke ha nāgaghi-adi ndu nime ha;

26. M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.

27. N'ihi nka, gwa ulo Israel okwu, gi nwa nke madu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bu kwa na nka ka nna-unu-hà kwulurum, n'imekpu emekpu megidem.