Bible Nso

Ezikiel 17:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, tua otù ilu, tu-kwa-ra ulo Israel otù ilu;

3. si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:

4. ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n'ala izu-ahia; n'obodo ndi-ahia ka o doro ya.

5. O we chiri ufọdu na nkpuru ala ahu, kua ya n'ubi di nma iku nkpuru; ọ kuru ya n'akuku ọtutu miri; dika osisi willow ka o tiyere ya.