Bible Nso

Abù Nke Abù 8:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi:N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu;Ekworo siri ike dika ala-mọ:Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku,Ire-ọku nke Ja onwe-ya.

7. Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya,Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya:Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya,Agēleda ya anya nke-uku.

8. Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà,Ma ọ dighi ara ọ kpuru:Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayiN'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?

9. Ọ buru na ọ bu mb͕idi,Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha:Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ,Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.

10. Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya:Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo.

11. Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon;Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche;Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri.