Bible Nso

Abù Nke Abù 6:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru,Ka ayi we soro gi chọ ya?

2. Onye ihe-ya nātọm utọ aridaruwo ubi-ya ab͕ara ogige, rue nkpuru nile nke uda,Izù ìgwè aturu-ya n'ubi-ya nile ab͕ara ogige, na ichikọta urodi.

3. Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, onye ihe-ya nātọm utọ bu kwa nkem:Bú onye ahu nke nāzù ìgwè aturu-ya n'etiti urodi.

4. Onye mara nma ka i bu, eyìm, dika Tiaza,I mara nma nke-uku dika Jerusalem,I bu onye anātu ujọ dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ.

5. Wepu anya-gi abua n'irum,N'ihi na ha onwe-ha akpaliwom elu.Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.

6. Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu,Nke siworo n'isa-aru rigota;Nke ha nile chi umu abua umu abua,Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.