Bible Nso

1. Ndi-Eze 8:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.

18. Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:

19. otú ọ di, gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu: kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.

20. Jehova emewo kwa ka okwu-Ya nke O kwuru guzosie ike; m'we bilie n'ọnọdu Devid, bú nnam, nọkwasi n'oche-eze Israel, dika Jehova kwuru, m'we wuere aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo,

21. doro ib͕e ahu ọnọdu n'ebe ahu, bú ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu Jehova di n'ebe ahu, bú ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na nna-ayi-hà b͕ara, mb͕e O mere ka ha si n'ala Ijipt puta.

22. Solomon we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:

23. ọ si, Jehova, bú Chineke Israel, ọ dighi Chineke dika Gi, n'elu-igwe di n'elu, ma-ọbu n'elu uwa di n'okpuru; I nēdebere ndi-orù-Gi ọb͕ub͕a-ndu na ebere, bú ndi were obi-ha nile nējeghari n'iru Gi: