Bible Nso

1. Ndi-Eze 8:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ahu Solomon kpọkọtara ndi-okenye Israel, na ndi-isi nile nke ebo nile ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna umu Israel, ibiakute eze, bú Solomon, nime Jerusalem, isi n'obodo Devid, nke ahu bu Zaion, bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

2. Ndikom nile nke Israel we kpọkọta onwe-ha biakute eze, bú Solomon, n'ememe, n'ọnwa Etanim, nke ahu bu ọnwa nke-asa.

3. Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi-nchu-àjà we bulie ib͕e ahu.

4. Ha we bugota ib͕e Jehova, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà na ndi Livai we bugota ha.

5. Eze, bú Solomon, na nzukọ nile nke Israel, bú ndi nēzukọta n'ebe ọ nọ, nọyere ya n'iru ib͕e ahu, n'āchu àjà ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, nke anādighi-agu ha ọnu, nke anādighi-aguta kwa ha n'ihi iba-uba-ha.

6. Ndi-nchu-àjà we bubata ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe-ya, nime ime-ime-ulo nke ulo ahu, rue ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, rue n'okpuru nkù cherubim.

7. N'ihi na cherubim nāb͕asa nkù-ha rue ebe ib͕e ahu, cherubim we nēkpuchi ib͕e ahu na nkpa-n'aka-ya abua n'elu.

8. Nkpa-n'aka we di ogologo, ewe hu isi nkpa-n'aka site n'ebe nsọ n'iru ime-ime-ulo ahu; ma adighi-ahu ha n'èzí: ha we di n'ebe ahu, rue ta.

9. Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses dọbara n'ebe ahu na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'ala Ijipt puta.

10. O rue, mb͕e ndi-nchu-àjà siri n'ebe nsọ puta, na igwe-oji juputara ulo Jehova,