Bible Nso

1. Ndi-Eze 7:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọnọdu window di kwa n'akuku atọ, ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

5. Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n'ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

6. O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha.

7. Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n'ala ulo rue ala ulo.

8. Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye,) dika uzọ-nbata nka.

9. Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n'ime na n'èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n'èzí rue ogige uku ahu.

10. Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ.