Bible Nso

1. Ndi-Eze 7:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.

15. O we kpua ogidi ọla abua, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di: ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ogidi nke-abua buruburu.

16. O me-kwa-ra isi abua nke ọla awuru awu, itiye n'elu ogidi: cubit ise ka idi-elu otù isi di, cubit ise ka idi-elu isi nke-ọzọ di kwa.

17. Ihe-ọkpukpa, bú ihe emere ka ha yie ihe-ọkpukpa, na ihe aturu atu, bú ihe emere ka ha yie iyab͕a, diri isi nke di n'elu ogidi abua; asa diri otù isi, asa di-kwa-ra isi nke-ọzọ.

18. O me ogidi abua ahu; akuku abua dikwasi otù ihe-ọkpukpa buruburu, ikpuchi isi nke di n'elu pomegranate: otú a ka o me-kwa-ra isi nke-ọzọ.

19. Isi nke di n'elu ogidi n'uzọ-nbata ahu bu ihe emere ka ha yie urodi, cubit anọ.

20. Ma isi di kwa n'elu ogidi abua ahu n'elu, na ncherita-iru afọ nke di n'akuku ihe-ọkpukpa: pomegranate di ọgu iri, n'akuku nke dikwasi isi nke-ọzọ buruburu.

21. O guzo ogidi abua ahu n'uzọ-nbata nke ulo uku Chineke: o guzo ogidi aka-nri, kpọ aha-ya Jakin: o guzo ogidi aka-ekpe, kpọ aha-ya Boaz.