Bible Nso

1. Ndi-Eze 7:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n'iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile.

2. O we wue ulo oké ọhia Lebanon; ọgu cubit ise ka ogologo-ya di, ọgu cubit abua na iri ka obosara-ya di kwa, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di, ọ di n'elu akuku anọ nke ogidi osisi cedar, osisi cedar awara awa di kwa n'elu ogidi ahu.

3. Ewere osisi cedar kpuchie ya n'elu, n'elu ọgu ulo ntà nke akuku abua na ise, nke di n'elu ogidi; iri na ise n'otù akuku.

4. Ọnọdu window di kwa n'akuku atọ, ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

5. Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n'ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

6. O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha.

7. Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n'ala ulo rue ala ulo.

8. Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye,) dika uzọ-nbata nka.

9. Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n'ime na n'èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n'èzí rue ogige uku ahu.

10. Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ.

11. Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n'elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar.

12. Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe.

13. Eze Solomon we ziga si na Taia kuputa Hairam.