Bible Nso

1. Ndi-Eze 6:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Ulo ahu, mb͕e anēwu ya, eji nkume nke awazuru awazu mb͕e ebutere ya wue ya: anughi kwa otùtù ma-ọbu anyu-ike ma-ọbu ihe-ọlu ọ bula nke ígwè n'ulo ahu, mb͕e anēwu ya.

8. Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ.

9. O we wue ulo ahu, wusia ya; o we were ibo na akuku osisi cedar kpue ulo ahu.

10. O wue okpukpu-ulo n'aru ulo ahu nile, cubit ise ka idi-elu-ha di: ha we dabere n'ulo ahu n'osisi cedar.

11. Okwu Jehova we biakute Solomon, si,

12. Ulo a nke gi onwe-gi nēwu, ọ buru na i jegharia n'ukpurum nile, ọ buru kwa na i me ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ buru kwa na i debe ihe nile M'nyere n'iwu ijeghari nime ha; M'gēme kwa ka okwum guzosie ike n'ebe i nọ, bú nke M'gwara Devid, bú nna-gi.

13. M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gaghi-arapu kwa ndim, bú Israel.

14. Solomon we wue ulo ahu, wusia ya.

15. O were ibo osisi cedar wue mb͕idi ulo ahu nime; site n'ala ulo rue mb͕idi nke okpukpu, o were osisi machita ha nime: o were ibo osisi fir machita ala ulo.