Bible Nso

1. Ndi-Eze 6:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt putasia, n'arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n'ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo.

2. Ma ulo ahu nke eze, bú Solomon, wuru Jehova, ọgu cubit atọ ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di.

3. Uzọ-nbata kwa nke di n'iru ulo uku nke ulo ahu, orú cubit ka ogologo-ya di, n'iru obosara ulo ahu; cubit iri ka obosara-ya di n'iru ulo ahu.

4. O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n'èzi.

5. O wu-kwa-ra okpukpu-ulo n'akuku mb͕idi ulo ahu buruburu, bú mb͕idi nile nke ulo ahu buruburu, ma nke ulo uku Chineke ahu, ma nke ime-ime-ulo ahu: o me-kwa-ra ulo ntà nke akuku buruburu:

6. Okpukpu-ulo nke dikarisiri ala, cubit ise ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-etiti kwa, cubit isi ka obosara-ya di, okpukpu-ulo nke-atọ kwa, cubit asa ka obosara-ya di: n'ihi na o tiyere ngwe n'ulo ahu buruburu n'èzí, ka ihe we ghara ibà na mb͕idi ulo ahu.