Bible Nso

1. Ndi-Eze 3:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.

16. Mb͕e ahu ndinyom abua, bú ndi nākwa iko, biakutere eze, guzo n'iru ya.

17. Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n'otù ulo; m'we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n'ulo.

18. O rue, n'ubọchi nke-atọ mb͕e m'musiri nwa, na nwayi a mu-kwa-ra nwa; ayi onwe-ayi nọ kwa n'otù ebe; ọ dighi onye ala ọzọ ayi na ya nọ n'ulo, nání ayi abua nọ n'ulo.

19. Nwa nwayi a we nwua n'abali; n'ihi na o dinakwasiri ya.