Bible Nso

1. Ndi-Eze 22:19-26 Bible Nso (IGBOB)

19. Ọ si, N'ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'akuku Ya n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya.

20. Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a.

21. Mọ ahu we puta, guzo n'iru Jehova, si, Mu onwem gārafu ya.

22. Jehova we si ya, Gini ka i gēji? Ọ si, M'gāpu, buru mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-ya nile. Ọ si, I gārafu ya, i gēnwe kwa ike: pua, me otú a.

23. Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.

24. Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu?

25. Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi.

26. Eze Israel we si, Kuru Maikaia, me ka ọ laghachikuru Emon, bú onye-isi obodo, laghachikuru kwa Joash, bú nwa eze;