6. Ugolo-ọma we nēbutere ya achicha na anu n'ututu, na achicha na anu n'anyasi; ọ nāṅu kwa miri sitere na miri-iyi ahu.
7. O rue, mb͕e ubọchi ufọdu gasiri, na miri-iyi ahu takọrọ, n'ihi na miri-ozuzo adighi n'ala.
8. Okwu Jehova we rue ya nti, si,
9. Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi.
10. O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n'ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n'ihe, ka m'we ṅua.
11. O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n'aka-gi.